Levitikọs 20:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 “‘Ọ bụrụ na e nwee onye kpọrọ nna ya na nne ya iyi,+ a ghaghị igbu ya.+ Ọ bụ nna ya na nne ya ka ọ kpọrọ iyi. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.+ Diuterọnọmi 27:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-elelị nna ya ma ọ bụ nne ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) Ilu 17:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 Nwa nzuzu bụụrụ nna ya+ ihe mkpasu iwe, bụkwaara nne mụrụ ya ihe obi ilu.+ Ilu 20:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Onye ọ bụla nke na-akpọ nna ya na nne ya iyi,+ oriọna ya ga-anyụ mgbe ọchịchịrị na-eru nso.+ Ilu 23:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Gee nna nke mụrụ gị ntị,+ eledakwala nne gị anya naanị n’ihi na o mewo agadi.+ Ilu 30:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 E nwere ọgbọ nke na-akpọ ọbụna nna ya iyi, nke na-adịghịkwa agọzi ọbụna nne ya.+ Ilu 30:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Anya nke na-akwa nna ya emo, nke na-elegharakwa irubere nne ya isi+—ugoloọma nke ndagwurugwu ga-aghụpụta ya, ụmụ ugo ga-erikwa ya. Maịka 7:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 N’ihi na nwata nwoke na-eleda nna ya anya; nwata nwaanyị na-ebili imegide nne ya;+ nwunye nwa na-ebilikwa imegide nne di ya;+ ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.+ 2 Timoti 3:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,+ ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe,+
9 “‘Ọ bụrụ na e nwee onye kpọrọ nna ya na nne ya iyi,+ a ghaghị igbu ya.+ Ọ bụ nna ya na nne ya ka ọ kpọrọ iyi. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.+
16 “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-elelị nna ya ma ọ bụ nne ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
17 Anya nke na-akwa nna ya emo, nke na-elegharakwa irubere nne ya isi+—ugoloọma nke ndagwurugwu ga-aghụpụta ya, ụmụ ugo ga-erikwa ya.
6 N’ihi na nwata nwoke na-eleda nna ya anya; nwata nwaanyị na-ebili imegide nne ya;+ nwunye nwa na-ebilikwa imegide nne di ya;+ ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.+
2 N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,+ ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe,+