Ọpụpụ 20:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 “Sọpụrụ nna gị na nne gị+ ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị.+ Levitikọs 19:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 “‘Onye ọ bụla tụọ egwu nne ya na nna ya,+ debekwanụ ụbọchị izu ike m.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. Ilu 1:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị,+ ahapụkwala iwu nne gị.+ Ndị Efesọs 6:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ+ unu isi n’ime+ Onyenwe anyị, n’ihi na nke a bụ ezi omume:+
3 “‘Onye ọ bụla tụọ egwu nne ya na nna ya,+ debekwanụ ụbọchị izu ike m.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.