8 ka e nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Esaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o bunye m osisi m ga-eji wuo ọnụ ụzọ ámá nke Ebe E Wusiri Ike+ nke ụlọ ahụ,+ nakwa iji rụọ mgbidi+ obodo ahụ na ụlọ m ga na-abanye.” Eze wee bunye m ihe ndị ahụ, dị ka aka dị mma nke Chineke nke dị n’ahụ́ m si dị.+
28 Onye na-ekwu banyere Saịrọs,+ sị, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-eme ihe niile na-atọ m ụtọ;+ ọ ga-eme ọbụna ihe m kwuru banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ewughachi ya,’ na ihe m kwuru banyere ụlọ nsọ ya, sị, ‘A ga-atọ ntọala gị.’”+
17 N’ihi na Chineke tinyere ya n’obi ha imezu echiche ya,+ ya bụ, imezu otu echiche ha site n’inye anụ ọhịa ahụ alaeze ha,+ ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke.+