26 Unu hụkwara ma nụ otú Pọl a si mee ka ìgwè mmadụ dị ukwuu kweta, meekwa ka ha nwee echiche dị iche, ọ bụghị naanị n’Efesọs+ kama n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ógbè Eshia dum, na-asị na chi ndị e ji aka mee+ abụghị chi.
16 Kwenụ ka okwu nke Kraịst biri n’ime unu n’ụba, ka o meekwa ka unu nwee amamihe niile.+ Jirinụ abụ ọma+ na otuto a na-enye Chineke na abụ ime mmụọ+ na amara na-ezi ibe unu ihe,+ na-adụkwa ibe unu ọdụ, na-abụkunụ Jehova abụ n’ime obi unu.+