3 O wee zụọ gị ka ị dị umeala ma mee ka agụụ+ gụọ gị wee nye gị mana,+ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna gị hà na-amaghị; iji mee ka ị mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta ga-eme ka mmadụ dị ndụ.+
10 Ma ọ sịrị ya: “Dị ka otu n’ime ụmụ nwaanyị nzuzu+ si ekwu okwu, otú ahụ ka gị onwe gị na-ekwukwa. Ọ̀ bụ naanị ihe ọma ka anyị ga na-anara n’aka ezi Chineke ma ghara ịnara ihe ọjọọ?”+ N’ihe a niile, Job ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.+
22 Ya mere, lee obiọma Chineke+ na otú o si emesi mmadụ ike.+ Ọ na-emesi ndị dara ada ike,+ ma obiọma Chineke dị n’ebe ị nọ,+ ma ọ bụrụ na ị nọgide n’obiọma ya; ma ọ́ bụghị otú ahụ, a ga-egbupụkwa gị.+