8 Nwaanyị m na-alụ ọhụrụ,+ ka mụ na gị si na Lebanọn+ pụọ, ka mụ na gị si na Lebanọn pụọ. Si n’elu ugwu Amana, n’elu ugwu Sina,+ ọbụna Hemọn,+ gbadaa, ka anyị si n’ọgba ọdụm nakwa n’ugwu agụ owuru gbadaa.
29 Onye nwe nwaanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nwoke na-alụ ya.+ Otú ọ dị, mgbe enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ guzo ọtọ wee nụ olu ya, ọ na-enwe oké ọṅụ n’ihi olu nwoke ahụ nke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ya mere, e mewo ka ọṅụ a m nwere zuo ezu.+