17 Chineke m, amaara m nke ọma na ị bụ onye na-enyocha obi,+ nakwa na ịkwụwa aka ọtọ na-atọ gị ụtọ.+ Mụ onwe m ji obi ziri ezi nye ihe ndị a niile n’afọ ofufo, obi dịkwa m ụtọ ịhụ ndị gị bịara ebe a ka ha na-enye gị onyinye n’afọ ofufo.
1E nwere otu nwoke n’ala Ọz+ onye aha ya bụ Job;+ nwoke ahụ enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+ ọ bụkwa onye ezi omume,+ ọ na-atụ egwu Chineke,+ ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.+