16 Nweenụ ezi akọ na uche,+ ka ihere wee mee ha n’ihe ahụ ha na-ekwugide unu n’ihi ya,+ ya bụ, ndị na-ekwu okwu mkparị banyere omume ọma unu n’ime Kraịst.+
9 Lee! M ga-akpọta ndị si n’ụlọ nzukọ Setan bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ ndị Juu,+ ma ha abụghị kama ha na-agha ụgha+—lee! m ga-eme ka ha bịa kpọọ isiala+ n’ụkwụ gị, meekwa ka ha mara na ahụrụ m gị n’anya.