22 Unu ga-emerụkwa ihe e ji machie ihe oyiyi ọlaọcha unu niile a pịrị apị+ na ihe mkpuchi na-arapara n’ahụ́, bụ́ nke e ji kpuchie ihe oyiyi ọlaedo+ unu a wụrụ awụ.+ Unu ga-atụsasị ha.+ Dị ka nwaanyị nke nọ ná nsọ ya, ị ga-asị ha: “Unu bụ ihe ruru unyi!”+
7 N’ihi na n’ụbọchị ahụ, onye ọ bụla n’ime ha ga-ajụ chi ya na-abaghị n’ihe, ndị e ji ọlaọcha mee, na chi ya na-abaghị uru, ndị e ji ọlaedo mee,+ ndị unu ji aka unu meere onwe unu ka ha bụrụ mmehie.+