28 N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche,+ bụ́ ndị aka mmadụ mere, osisi na nkume,+ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.+
2 Ugbu a, ha na-emekwu mmehie, jirikwa ọlaọcha ha na-emere onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ arụsị dị iche iche,+ dị ka nghọta ha si dị, ha niile bụ aka ọrụ ndị omenkà.+ Ha na-agwa ha, sị, ‘Ka ụmụ mmadụ ndị na-achụ àjà susuo ụmụ ehi ọnụ.’+
20 Ma ndị fọdụrụ n’ime ndị ahụ a na-ejighị ihe otiti ndị a gbuo echegharịghị n’ihe ha ji aka ha na-arụ,+ ka ha wee ghara ife ndị mmụọ ọjọọ+ na arụsị e ji ọlaedo na ọlaọcha+ na ọla kọpa na nkume na osisi mee, bụ́ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ ije ije;+