6 Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele,+ ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.+ N’ihi na mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa, mmiri iyi ga na-agbapụtakwa na mbara ọzara.
13 Ma mgbe ha hụrụ otú Pita na Jọn si nwee nkwuwa okwu, ghọtakwa na ha bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,+ o juru ha anya. Ha wee malite ịmata na ha na Jizọs na-anọbu;+