26 “‘N’ihi na a hụwo ndị ajọ omume n’etiti ndị m.+ Ha na-enyogharị anya, dị ka mgbe ndị na-achụ nta nnụnụ hulatara ala.+ Ha esiwo ọnyà nke na-ebibi ihe. Ọ bụ mmadụ ka ha na-amata n’ọnyà.
3 Aka ha dị n’ihe ọjọọ, imeta ya nke ọma;+ onyeisi na-ekwu ka e nye ya ihe, onye na-ekpe ikpe na-ekpekwa ikpe iji nata ụgwọ ọrụ,+ onye ukwu na-ekwukwa ihe si ya n’obi, uche nke aka ya;+ ha na-agbakọ aka eme ya.