13 Hezekaya wee gee ha ntị ma gosi ha ụlọ ndebe akụ̀+ ya dum, ọlaọcha na ọlaedo+ na mmanụ bọlsọm+ na ezigbo mmanụ na ngwá agha ya na ihe niile dị n’ebe a na-edebe akụ̀ ya. Ọ dịghị ihe Hezekaya na-egosighị ha n’ụlọ ya nakwa n’ebe niile ọ na-achị.+
27 Hezekaya wee nwee akụnụba na ebube nke ukwuu;+ o wukwaara onwe ya ụlọ nkwakọba ihe maka ịkwakọba ọlaọcha na ọlaedo+ na nkume dị oké ọnụ ahịa+ na mmanụ bọlsọm+ na ọta+ na ihe niile a na-achọsi ike;+