17 ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma,+ na-enye unu mmiri ozuzo+ site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.”+
20 N’ihi na àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya+ ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu,+ n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke,+ ya bụ, ike ebighị ebi ya+ na ịbụ Chineke ya,+ nke mere na ha enweghị ihe ngọpụ;+