12 Ọkpụ ụ́zụ́ nke ji ihe o ji akpụ ụ́zụ́ ji ya na icheku ọkụ na-arụ ihe; o wee jiri hama na-akpụ ya, jirikwa ogwe aka ya dị ike na-arụ ya.+ Agụụ agụwala ya, ike adịghịzi ya. Ọ ṅụbeghị mmiri; ike wee gwụ ya.
6 E nwere ndị na-awụfusị ọlaedo dị n’akpa, ndị na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ọlaọcha. Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, o wee jiri ya kpụọ chi.+ Ha na-adara ya n’ala, ee, ha na-akpọrọ ya isiala.+