15 Ị̀ ga na-achị n’ihi na i ji osisi sida na-egosi na ị ka ndị ọzọ? Ọ̀ bụ na nna gị erighị ihe oriri, ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma mee ihe n’ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume?+ Ihe wee gaziere ya.+
8 Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma.+ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi+ na ịhụ obiọma+ n’anya nakwa iji obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije?+