20 N’ụbọchị ahụ, mmadụ ga-atụfusị chi ya na-abaghị n’ihe, ndị e ji ọlaọcha mee, na chi ya na-abaghị uru ndị e ji ọlaedo mee, ndị e meere ya ka ọ na-akpọ isiala n’ihu ha. Ọ ga-atụpụrụ ha nkapị na ụsụ,+
20 “Zukọtanụ bịa.+ Gbakọtanụ bịa nso, unu ndị si ná mba dị iche iche gbapụ.+ Ndị na-ebugharị ihe oyiyi ha e ji osisi pịa amaghị ihe ọ bụla, otú ahụkwa ka ọ dị ndị na-ekpeku chi nke na-apụghị ịzọpụta mmadụ ekpere.+
5 Ha dị ka ihe e ji achụ anụmanụ n’ubi kukumba, ha apụghị ikwu okwu.+ A na-ebu ha ebu, n’ihi na ha apụghị ịga ije.+ Atụla egwu n’ihi ha, n’ihi na ha apụghị iweta ọdachi ọ bụla, ha adịghịkwa eme ihe ọma ọ bụla.”+