17 “Ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị ogbenye na-achọ mmiri,+ ma mmiri adịghị. Ire ha akpọwo nkụ+ n’ihi agụụ mmiri.+ Mụ onwe m bụ́ Jehova ga-aza ha.+ Mụ onwe m, bụ́ Chineke Izrel, agaghị ahapụ ha.+
17 Mmụọ nsọ+ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị: “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: “Bịa!”+ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa;+ onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.+