10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
12“N’oge ahụ, Maịkel+ ga-ebili, bụ́ nnukwu onyeisi+ ahụ nke guzo ọtọ+ n’ihi ụmụ ndị gị.+ A ga-enwekwa oge ahụhụ nke a na-enwetụbeghị kemgbe e nwere mba ruo n’oge ahụ.+ N’oge ahụ, ndị gị ga-alanahụ,+ onye ọ bụla e dere aha ya n’akwụkwọ.+