14 O wee zaa, sị: “Ee e, kama mụ onwe m bịara ugbu a dị ka ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova.”+ Jọshụa wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpọọ isiala+ wee sị ya: “Gịnị ka onyenwe m na-agwa ohu ya?”
6 N’ihi na a mụworo anyị otu nwa,+ e nyewokwa anyị otu nwa nwoke;+ ịchịisi ga-adị n’ubu ya.+ A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chineke nke bụ́ Dike,+ Nna Mgbe Ebighị Ebi,+ Onyeisi Udo.+