7 “M ga-edebe ọgbụgba ndụ m nke dị n’etiti mụ na gị+ na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị n’ọgbọ ha niile ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ruo mgbe a na-akaghị aka,+ ka m wee gosi na m bụ Chineke gị nakwa Chineke nke mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị.+
9 M ga-etinye otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ n’ọkụ;+ m ga-anụcha ha dị ka e si anụcha ọlaọcha,+ nwaleekwa ha dị ka e si anwale ọlaedo.+ Ma, ha ga-akpọku aha m, m ga-azakwa ha.+ M ga-asị, ‘Ha bụ ndị m,’+ ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Jehova bụ Chineke anyị.’”+