10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
10 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ+ na a ga-enwe mgbọrọgwụ Jesi+ nke ga-eguzo ọtọ dị ka ihe mgbaàmà dịịrị ndị dị iche iche.+ Ọ bụkwa ya ka ọbụna mba niile ga-echigharịkwuru ma jụọ ase.+ Ebe izu ike ya ga-adịkwa ebube.+