2 “Mee ka ụlọikwuu gị sakwuo mbara.+ Ka e setịa ákwà ụlọikwuu nke ebe obibi gị dị ebube. Akparala ya ókè. Mee ka ụdọ ụlọikwuu gị dị ogologo, meekwa ka mkpọ́ ụlọikwuu gị sie ike.+
6 Ma a ga-akpọ unu ndị nchụàjà Jehova;+ a ga-asịkwa na unu bụ+ ndị ozi+ nke Chineke anyị. Unu ga-eri akụ̀ nke mba dị iche iche.+ Unu ga-eji aṅụrị na-ekwu okwu banyere onwe unu n’ihi ebube ha.+
7 “‘M ga-eme ka mba niile maa jijiji, ihe a na-achọsi ike nke mba niile ga-abata;+ m ga-emekwa ka ụlọ a jupụta n’ebube,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.