10 Unu ga-edo afọ nke iri ise nsọ ma kpọsaara ndị niile bi n’ala unu nnwere onwe.+ Ọ ga-abụrụ unu afọ Jubili,+ onye nke ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala ya, onye nke ọ bụla n’ime unu ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.+
2 N’ihi na ọ na-asị: “Ọ bụ n’oge a na-anabata ndị mmadụ ka m nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka m nyeere gị aka.”+ Lee! Ugbu a bụ oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa.+ Lee! Ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.+