18 Ma, m ga-ebu ụzọ kwụzuo ha ụgwọ njehie ha+ na ụgwọ mmehie ha, n’ihi na ha merụrụ ala m.+ Ha emewo ka ozu ihe arụ ha na nke ihe ha jọgburu onwe ha jupụta n’ihe nketa m.’”+
21 “‘“Ma ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe arụ ha na ihe ha ndị jọgburu onwe ha,+ m ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ha metara,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’”+
4 “Oleekwa ihe jikọrọ mụ na unu, Taya na Saịdọn+ na unu ógbè niile nke Filistia?+ Ọ̀ bụ mmeso a ka unu ji na-akwụ m ụgwọ? Ọ bụrụkwa otú a ka unu na-emeso m, m ga-akwụ unu ụgwọ mmeso unu ngwa ngwa, n’egbughị oge.+