23 n’ihi na nnupụisi+ na mmehie nke ịgba afa+ bụ otu ihe, iji mpako na-ebute ụzọ n’ihe na iji ike anwansi na terafim eme ihe bụ otu ihe.+ Ebe ọ bụ na ị jụwo okwu Jehova,+ ya onwe ya ajụwo gị ka ị ghara ịbụkwa eze.”+
13 Kwụsịnụ iwebata àjà ọka* na-abaghị uru.+ Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ unu bụ ihe arụ n’anya m.+ Ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ na ụbọchị izu ike unu,+ ịkpọ òkù ka e nwee mgbakọ,+ apụghị m ịnabata ime anwansi+ nakwa nzukọ ukwu.