6 “‘Ma mkpụrụ obi nke chigharịkwuuru ndị na-agba afa+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu+ ka o wee soro ha nwee mmekọ rụrụ arụ, m ga-eche ihu m megide mkpụrụ obi ahụ wee bipụ ya n’etiti ndị ya.+
10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
3 Samuel anwụwo, Izrel dum akwaworo ya ákwá arịrị ma lie ya na Rema bụ́ obodo ya.+ Ma Sọl emewo ka a ghara inwekwa ndị na-agba afa na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu n’ala ahụ.+
13 Sọl wee si otú a nwụọ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi ya nke o ji enweghị okwukwe+ meso Jehova n’ihe metụtara okwu Jehova nke ọ na-edebeghị nakwa n’ihi ịgwa onye na-agba afa+ ka ọ jụọrọ ya ase.
19 Ọ bụrụkwa na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ase+ ma ọ bụ ndị nwere mmụọ ịkọ ọdịnihu, bụ́ ndị na-ebe ubé,+ na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ọ́ bụghị Chi ha ka ndị ọ bụla kwesịrị ịjụ ase?+ È kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ?+