31 “‘Unu echigharịkwurula ndị na-agba afa,+ unu ajụkwala ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu ase,+ ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
6 “‘Ma mkpụrụ obi nke chigharịkwuuru ndị na-agba afa+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu+ ka o wee soro ha nwee mmekọ rụrụ arụ, m ga-eche ihu m megide mkpụrụ obi ahụ wee bipụ ya n’etiti ndị ya.+
27 “‘Ma nwoke ma ọ bụ nwaanyị nke nwere mmụọ ịgba afa ma ọ bụ mmụọ ịkọ ọdịnihu,+ a ghaghị igbu ya.+ A ga-eji nkume tụgbuo ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.’”+
11 ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase+ ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.+
8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị rụrụ arụ n’ihi omume ha ruru unyi+ na ndị na-egbu ọchụ+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị+ na ndị ụgha niile,+ òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ+ na sọlfọ+ na-enwu. Nke a pụtara ọnwụ nke abụọ.”+