6 “‘Ma mkpụrụ obi nke chigharịkwuuru ndị na-agba afa+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu+ ka o wee soro ha nwee mmekọ rụrụ arụ, m ga-eche ihu m megide mkpụrụ obi ahụ wee bipụ ya n’etiti ndị ya.+
10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
3 Samuel anwụwo, Izrel dum akwaworo ya ákwá arịrị ma lie ya na Rema bụ́ obodo ya.+ Ma Sọl emewo ka a ghara inwekwa ndị na-agba afa na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu n’ala ahụ.+
15 N’azụ obodo ka nkịta+ na ndị na-eme mgbaasị+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-egbu ọchụ na ndị na-ekpere arụsị na onye ọ bụla nke nwere mmasị n’ịgha ụgha, nke na-aghakwa ụgha,+ nọ.’