27 “‘Ma nwoke ma ọ bụ nwaanyị nke nwere mmụọ ịgba afa ma ọ bụ mmụọ ịkọ ọdịnihu,+ a ghaghị igbu ya.+ A ga-eji nkume tụgbuo ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.’”+
16 O wee daba na ka anyị nọ na-eje n’ebe a na-ekpe ekpere, otu nwa agbọghọ na-eje ozi, onye nwere otu mmụọ,+ bụ́ mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase,+ zutere anyị. Ọ na-ewetara ndị nna ya ukwu uru dị ukwuu+ site n’ịkọ ọdịnihu.