31 “‘Unu echigharịkwurula ndị na-agba afa,+ unu ajụkwala ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu ase,+ ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
7 N’ikpeazụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi: “Chọọrọnụ m nwaanyị mgbaasị,+ m ga-agakwuru ya jụọ ya ase.” Ndị na-ejere ya ozi wee sị ya: “Lee! E nwere nwaanyị mgbaasị nọ n’En-dọọ.”+
8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị rụrụ arụ n’ihi omume ha ruru unyi+ na ndị na-egbu ọchụ+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị+ na ndị ụgha niile,+ òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ+ na sọlfọ+ na-enwu. Nke a pụtara ọnwụ nke abụọ.”+