3 Samuel anwụwo, Izrel dum akwaworo ya ákwá arịrị ma lie ya na Rema bụ́ obodo ya.+ Ma Sọl emewo ka a ghara inwekwa ndị na-agba afa na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu n’ala ahụ.+
19 Ọ bụrụkwa na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ase+ ma ọ bụ ndị nwere mmụọ ịkọ ọdịnihu, bụ́ ndị na-ebe ubé,+ na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ọ́ bụghị Chi ha ka ndị ọ bụla kwesịrị ịjụ ase?+ È kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ?+