2 “Ọ bụ aka m mere ihe a niile, nke mere ihe a niile ji dịrị,”+ ka Jehova kwuru. “Ọ bụ onye ihe na-enye nsogbu n’obi, onye nwere mwute na mmụọ ya,+ onye na-amakwa jijiji n’ihi okwu m+ ka m ga-elekwasị anya.
5 “Ma ọgbụgba ndụ m, bụ́ nke ndụ na nke udo,+ dị n’ebe ọ nọ, m wee were ya na-enye ya, ka o wee tụọ egwu m. O wee na-atụ egwu m;+ ee, ụjọ jidere ya n’ihi aha m.+
12 N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, otú ahụ unu si na-erube isi mgbe niile,+ ọ bụghị naanị mgbe m nọ ya, kama ugbu a m na-anọghị ya, na-erubenụ isi karị, jirinụ egwu+ na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta;