19 Ma gị onwe gị, a tụfuola gị dị ka ome a na-asọ oyi, n’enweghị ebe a ga-eli gị.+ I yi ndị e gburu egbu dị ka uwe, bụ́ ndị e ji mma agha magbuo, ndị na-agbada na nkume ndị dị n’olulu,+ dị ka ozu a na-azọ ụkwụ.+
5 M ga-agbahapụ gị n’ala ịkpa, gị na azụ̀ niile dị n’ọwa mmiri niile nke Naịl gị.+ N’elu ala ka ị ga-ada.+ A gaghị achịkọta gị, a gaghịkwa atụtụkọta gị. M ga-ewere gị nyefee anụ ọhịa nke ụwa na anụ ufe nke eluigwe ka ị bụrụ nri ha.+