11 Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta okirikiri unu. Jehova akpaliwo mmụọ nke ndị eze ndị Midia,+ n’ihi na o bu n’obi imegide Babịlọn,+ iji laa ya n’iyi. N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova, bụ́ ọbọ ọ ga-abọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+
28 Kwadebe mba dị iche iche, tinyere ndị eze Midia,+ ndị gọvanọ ya, na ndị ya niile na-esote onye na-achị achị na ala dum onye nke ọ bụla na-achị, ka ha buso ya agha.