11 Onye ga-akpọ nnụnụ na-eri anụ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa,+ kpọọkwa onye ga-emezu ihe m kpebiri ka o si n’ala dị anya bịa.+ Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo.+ Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.+
28 N’ihi ya, ala ahụ ga-eru uju,+ eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.+ Ọ bụ n’ihi na ekwuwo m ya, echebaworo m ya echiche, enweghịkwa m mwute, agaghịkwa m ala azụ n’ime ya.+