2 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Onye ọ bụla nke nọgidere n’obodo a, mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe+ ga-egbu ya. Ma onye ọ bụla nke gakwuuru ndị Kaldia ga-anọ ndụ, mkpụrụ obi ya ga-abụrụ ya ihe nkwata, ọ ga-adịkwa ndụ.’+
15 Mma agha dị n’èzí,+ e nwere ọrịa na-efe efe na ụnwụ n’ime ụlọ.+ A ga-eji mma agha gbuo onye ọ bụla nọ n’ubi, ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịakwa ndị nọ n’ime obodo.+