14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
6 Unu ekwela ka mmadụ ọ bụla jiri okwu efu ghọgbuo unu,+ n’ihi na ọ bụ n’ihi ihe ndị ahụ e bu ụzọ kwuo ka ọnụma nke Chineke na-abịakwasị ụmụ nnupụisi.+