14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
15 “‘N’ihi na edunyeghị m ha,’ ka Jehova kwuru, ‘kama ha na-ebu amụma ụgha n’aha m, ka m wee chụsaa unu,+ unu ewee laa n’iyi,+ unu onwe unu na ndị amụma bụ́ ndị na-eburu unu amụma.’”+