6 Ma gị onwe gị, Pash-họ, na ndị niile bi n’ụlọ gị, a ga-adọrọ unu n’agha;+ ị ga-aga Babịlọn, ọ bụ n’ebe ahụ ka ị ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli gị na ndị niile hụrụ gị n’anya,+ n’ihi na i buworo ha amụma ụgha.’”+
21 Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru banyere Ehab nwa Kolaya na Zedekaya nwa Measaya, bụ́ ndị na-eburu unu amụma ụgha n’aha m,+ ‘Lee, m ga-enyefe ha n’aka Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn, ọ ga-egbukwa ha n’ihu unu.+