14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
8 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Unu ekwela ka ndị amụma unu bụ́ ndị nọ n’etiti unu nakwa ndị na-agbara unu afa duhie unu,+ unu egekwala ntị ná nrọ ha na-arọ.+
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.