42 O wee sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ị hapụwo nwoke m kpebiri na a ga-ebibi+ ka o si n’aka gị laa, a ga-eji mkpụrụ obi gị dochie anya mkpụrụ obi ya,+ jirikwa ndị gị dochie anya ndị ya.’”+
11 otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị.+ Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m,+ kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ,+ ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.+