2Ndị a bụ ndị si n’ógbè a na-achị achị,+ bụ́ ndị si n’etiti ndị a dọọrọ n’agha+ lọta, ndị Nebukadneza eze Babịlọn dọọrọ n’agha+ laa Babịlọn, ndị mesịkwara lọta+ Jeruselem na Juda,+ onye nke ọ bụla n’obodo nke ya;
6 M ga na-ele ha anya ọma,+ m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a.+ M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.+