9 Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum;+ n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.+
7 M ga-enye ha obi ha ga-eji mara m,+ na mụ onwe m bụ Jehova; ha ga-abụ ndị m,+ mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha, n’ihi na ha ga-eji obi ha dum lọghachikwute m.+
11 “‘Onye ọ bụla n’ime ha agaghịkwa akụziri nwa amaala ibe ya na nwanne ya, sị: “Mara Jehova!”+ N’ihi na ha niile ga-amara m,+ malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu n’ime ha.