5 ha na-asị, ‘Biko, ka onye ọ bụla hapụ ụzọ ọjọọ ya na omume ọjọọ ya+ wee biri n’ala Jehova nyere unu na nna nna unu hà malite n’oge dị anya gara aga ruo n’ogologo oge na-abịa abịa.+
30 “‘Ya mere, ọ bụ dị ka ụzọ onye ọ bụla si dị ka m ga-ekpe unu ikpe,+ ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Chigharịanụ, ee, hapụnụ mmebi iwu unu niile,+ ka ihe ọ bụla gharakwa ịbụrụ unu ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpata njehie.+
3 “Sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “‘Lọghachikwutenụ m,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘m ga-alọghachikwute unu,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”’