29 Ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso obodo a agha, ga-abata mụnye obodo a ọkụ wee gbaa ya ọkụ,+ tinyere ụlọ ndị dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ha nọ na-esurere Bel ihe nsure ọkụ, na-awụsakwara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ iji kpasuo m iwe.’+
22 “‘Lee, m ga-enye iwu,’ ka Jehova kwuru, ‘m ga-eme ka ha lọghachi n’obodo a,+ ha ga-ebuso ya agha, weghara ya ma gbaa ya ọkụ;+ m ga-emekwa ka obodo niile dị na Juda tọgbọrọ n’efu n’enweghị onye bi ha.’”+