4 Zedekaya eze Juda agaghịkwa agbapụ n’aka ndị Kaldia, n’ihi na a ghaghị inyefe ya n’aka eze Babịlọn, ya na ya ga-ekwu okwu ihu na ihu, ya na ya ga-ahụkwa ihu na ihu”’;+
18 Ma ọ bụrụ na ị gakwurughị ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi, a ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia, ha ga-agbakwa ya ọkụ,+ gị onwe gị agaghị agbapụ n’aka ha.’”+