7 Ndị niile hụrụ ha eripịawo ha,+ ndị iro ha asịwo,+ ‘Ikpe agaghị ama anyị,+ n’ihi na ha emehiewo Jehova bụ́ ebe obibi nke ezi omume+ na olileanya nke ndị nna nna ha,+ bụ́ Jehova.’”
11 Ndị Izrel niile emebiwokwa iwu gị, ha ahapụwo gị site n’ịjụ irube isi n’ihe i kwuru,+ i wee mee ka ọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi nke e dere n’iwu Mozis ohu ezi Chineke mezuo n’isi anyị,+ n’ihi na anyị emehiewo Ya.
5 Ma dị ka ekweghị ekwe+ gị na obi gị nke na-enweghị nchegharị+ si dị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma+ nke ga-abịakwasị gị n’ụbọchị ọnụma+ nakwa n’ụbọchị a ga-ekpughe+ ikpe ezi omume nke Chineke.+