49 “Jehova ga-eme ka mba nke nọ n’ebe dị anya,+ nke si n’ebe ụwa sọtụrụ, buso gị agha, dị nnọọ ka ugo si efekwasị n’ihe ọ ga-eburu,+ ya bụ, mba nke ị na-agaghị aghọta asụsụ ya,+
8 Ịnyịnya ya na-awụ ọsọ karịa agụ owuru, ha na-akpakwa ike karịa anụ ọhịa wolf+ ndị na-apụta n’anyasị. Ịnyịnya agha ya na-azọsi ụkwụ ike n’ala, ọ bụkwa n’ebe dị anya ka ịnyịnya agha ya si abịa. Ha na-efe ọsọ dị ka ugo nke na-efesi ike+ ịga rie ihe.