16 Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu;+ ka uche unu ghara ịdị n’ihe ndị dị elu,+ kama ka ihe ndị dị ala na-eduzi unu.+ Unu abụla ndị nwere uche n’anya onwe unu.+
5 Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya,+ ka unu nọ na-enwe afọ ojuju+ n’ihe ndị dị ugbu a.+ N’ihi na o kwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”+